FeaturedIgbo News

Njem Buhari na-eme abụghị maka nlegharị anya – Garba Shehu

Views

Garba Shehu, onye enyemaka Onyeisi ala Muhammadu Buhari na ihe gbasara mgbasaozi na ọha, na Sọnde kwuru na ọtụtụ njem nke onyeisi ala na-eme abụghị maka nlere anya.

O kwuru nke a n’emume ‘Political Programme’ nke ndị Channels Television.

Ndị mmadu akatọla Buhari, onye nọ London ugbu a, maka oke gagharị o ji ego obodo a eme.

Na mmeghachiahụ maka okwu ndị a, Shehu Garba kwuru na njem niile nke Onyeisi ala Muhammadu Buhari na-eme ga-abara ndị Naijiria uru.

O kwuru na aha Buhari ga-ebutere ndị Naijiria ọtụtụ ihe ọma.

Leave a Reply