Entertainment

Nigeria Film Corporation azụọ ndị ntorobịa nari

Views

Ndị Nigeria Film Corporation (NFC) enyela ndị ntorobịa narị ọzụzụ pụrụ iche nke gbasatara imeputa ihe nkiri onyoonyo. Ọzụzụ a bụ nke were abalị ise bụ maka ọdịmma ndị ntorobịa ya na ikepụta ọrụ dị iche iche. Ebe agbakwasara ụkwụ wee nye ọzụzụ a bụ: ‘scripting and acting’, ‘digital cinematography’, ‘directing’, ‘production management’, ‘digital editing’ nakwa ‘digital still photography’.

Onye ọka ikpe bụ Philip Tanimu bụ onye malitere ọzụzụ a bụrụkwa onye na-anọchị anya gọọmentị etiti. O nyere ndị ntorobịa iwu ka ha tinye ihe ha mụtara n’ọrụ ka o wee nye aka ikwalite akụnụba nke obodo a site na ibelata enweghi ọrụ di n’ala a.

Onye ntuziaka NFC site na ọnụ onye nnọchị anya ya bụ Alhaji Sanusi Sambo kwuru na emume bụ ka ewee nyere gọọmentị aka itinye ndi ntorobịa n’ọrụ. Nke a bụ iji belata mpu na arụrala si na aka ndi ntorobịa.

Enyekwara ndi ntorobịa asambodo iji gosi na ha alafela ọzụzụ a.

Leave a Reply