FeaturedIgbo News

Ngwa ahịa ruru nde naira agbaala ọkụ n’Abuja

Views

Otu ụlọ ahịa ama ama n’Abuja nke a na-akpọ ‘Amigo Supermarket’ nke nọ na Wuse 2 agbaala ọkụ n’ụbọchị Tuzde.

Mazi Jerry Timoh, onye nkwuchite ọnụ ụlọ ọrụ Federal Capital Territory Fire Service kwuru n’ajụjụ ọnụ a gbara ya na-achọpụtabeghi ihe kpatara ọkụ ahụ mana ha na-eleba anya na ya.

O kwuru na ọkụ a bidoro mgbe o ji ọkara gafee elekere mbu nke ehihie, mana ha menyụrụ ya mgbe ojiri ọkara gafee elekere asaa nke abalị.

Ọkụ a mebiri ngwa ahịa ebe ọ dị ukwuu; mana emenyụrụ tụpụ ofesa ebe niile. O nweghi ndi ọkụ a regburu ebe ndi ọrụ ụlọ ahịa ahụ gbapụrụ n’oge, ozugbo ọkụ ahụ bidoro.

Leave a Reply