Igbo News

Nextford ekwupụtala atụmatụ ha maka ikwado ndi ahịa

Views

Mahadum Nexford ekwupụla atụmatụ ya nke gbadoro ụkwụ n’ịzụ ndi ahịa na Naijiria, ka enwe ike mebaa akụnụba nke obodo a.

Onyeisi Nexford, Olamidun Majekodumni, kwuru nke a. O mekwara ka ndi mmadu mara na a ga-enwe ụbọchị mmepe ya bụ atụmatụ n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa September, n’Oriental Hotel, Lagos, ebe ndi ahịa ga-egosi echiche ha.

Majekodumni kwuru na isiokwu emume a ga-abụ, ‘Entrepreneurs Breaking Barriers’, ebe ndi mmadu ga-enweta ọzụzụ maka azụmahịa nakwa ego a ga-eji eme ka echiche ha bụrụ ihe ahụrụ anya.

O kwuru na nke a bụ ụzọ e si ebelata enweghi ọrụ na Naijiria.

Leave a Reply