Igbo News

Ndu na egwu Naira Marley kpaliri m ime wayo ịntanetị: Gabriel Michael

Views

Ndi uwe ojii nke Gombe Steeti na Tuuzde kpọgharịrị ndi wayo ịntanetị. Otu n’ime ha bụ Gabriel Michael, onye dị afọ iri na isii. Gabriel kwuru na ọ bụ egwu Naira Marley nakwa obibi ndu ya kpaliri ya.

Ịgụ egwu bụ ụzọ e ji agbasa ozi, agwa ọma na obibi ndu nke obodo. Egwu ndi Naijiria dịka ọ dị na mbu bụ nke na-ekwu maka ịhụnanya, agbamụmbo, ezi ọyị na ihe dị ọzọ dị mma.

Mana ugbu a, ụfọdụ egwu Naijiria bụ nke na-egosi mmekọahụ, ịgba ọtọ, ịṅụ mmanya, inwe ụbara ego na wayo ịntanetị. Ụdị ihe a bụ ihe ndi ntorobia ugbu a na-ele ma na-amụta.

Gabriel mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ kwuru na ọ mụtara ‘hacking’ site n’ihe nkiri Youtube mana otu Naira Marley si agha ego kpaliri ya ime wayo ịntanetị.

N’agbanyeghi na ndi uwe ojii dere na Gabriel Michael dị afọ iri na asatọ, Gabriel kwuru na mkparita ụka ha nwere na ọ dị afọ iri na isii.

Gabriel rịọrọ ndi uwe ojii ka ha gbaghara ya ma nye ya ohere itinye ihe ọmụtara n’ọrụ nchekwa Naijiria.

Ndi uwe ojii jidere Gabriel maka wayo ego ruru otu puku nari naira na iri asatọ na asaa (#187,000), nke o gwuru otu nwanyị a na-akpọ Tanko.

Ndi uwe ojii ka na-enyocha nwokorobia ma na-ele anya ịkpọpụ ya ụlọikpe.

Leave a Reply