FeaturedIgbo News

Ndi Yoruba enye otu Miyetti Allah ụbọchị atọ ịkpọpụta ndi gburu Ada Pa Fasoranti

Views

Otu ụmụokorobia ndi mpaghara ndida Naijiria a na-akpọ Yoruba Youth Socio-cultural Association (YYSA) egosila iwe ha maka ọnwụ Funke Olakunri, nwa onyeisi Afenifere bụ Pa Reuben Fasoranti; onye a si na ndi Fulani ọchị ehi gbagburu n’Ondo Steeti.

Dika onyeisi YYSA, Olalekan Hammed kwuru, otu ha na-enye otu Miyetti Allah Cattle Breeders Association ụbọchị atọ ịkpọpụta ndi gburu nwanne ha nwaanyi.

Ọ bụ eziokwu na ndi uwe ojii kwuru na ha amaghị ndi mere omume a; ma ọ bụ ndi ọchị ehi ka ọ bụ ndi ohi. N’agbanyeghi nke a, ndi otu YYSA kwuru na ha ga-ezukọ ma ụbọchị atọ ha nyere ndi Miyetti Allah gaa.

Ha gwara gọọmenti etiti ka o leba anya n’okwu a, ka ndi mere ihe hara ịla n’efu.

Funke Olakunrin bụ nwa nke abụọ nke Pa Fasoranti na-anwụnụ, ebe nwa ya a na-akpọ Bunmi nwụrụ n’afọ ole na ole gara aga.

 

Leave a Reply