Ndị uweojii mmadụ abụọ atụnyela isi ha n’ihe mberede okporoụzọ dakwasịrị ụgbọala Adams Oshiomole onye bụbụ onyeisi ndị APC na Naịjiria. Ihe mberede a mere n’ebe mgbachapụ Benin n’Edo steeti na Tuzde, Septemba 1 2020.
Ndị Sahara Reporters mere ka a mara na otu nnukwu ụgbọala ji ụgbọala ha nọ n’ime ya mere ebe ezumike ka ha na-aga Usen, Ovia South East LGA maka ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchị nke fọdụrụ ntakịrị ka Adams Oshiomole Tụnye isi ya.