Igbo News

Ndi Uwe Ojii Azọpụta Nwoke Ndi Ntọọ Ji N’osun Steeti

Views

Ndi uwe ojii nọ n’Osun Steeti kwuru na ha azọputala otu nwoke aha ya bụ Bewaji Oladipo na Satodee. Oladipo bụ onye atọọrọ n’okporoigwe na Legọọsi.

Onye na-ekwuchitere ndi uweojii Osun ọnụ bụ SP Folashade Odoro kwuru na ha zọpụtara nwoke a na Fraidee, mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asaa nke abali. Ọ bụ ndi ‘Puff Adder Operatives’ zọpụtara ya mgbe ha na-eme nkwusi na nyocha ụgbọala n’ụzọ awarawa Oshogbo-Ilorin.

Odoro kwuru na-atọrọ nwoke a ebe ọ gara iwere ego n’igwe eji ewere ego nke ndi bekee kpọrọ ‘Automated Teller Machine’, nke di n’akụkụ ebe obibi bụ na Iyana-Ipaja, Legọọsi. Ndi tọọrọ nwoke a bụ ụmụ okorobia ano; mmadu abụọ n’ime ha yi uwe ndi amị.

Ndi uwe ojii a sịrị na ndi ntọ a gbara ọsọ mgbe a kwụsịrị ha. Ha hapụrụ ụgbọala ha na onye ha ji ebe ahụ. Ndi uwe ojii kwuru na ha na-anwa ike ha ịhụ na-ejidere ndi ọjọọ a. Ha mere ka a mata na nwoke ahụ azọpụtara agakwurula ndi be ya.

Leave a Reply