Igbo News

Ndi uwe ojii akpochiela nwoke zuru ohi n’Ogun Steeti

Views

Ndi uwe ojii nọ na Ogun steeti kpọchiri Philip Efosa maka ohi ụgbọala o zuru na Lagos. Akpọchiri ya n’ụbọchị Sọndee ka o zuchara ụgbọala a. Ụgbọala o zuru bụ Toyota Corolla nke ya na onye otu ya soro zuo, mana ejideghi onye otu ya ahụ.

Onye uwe oji na-ahụ maka ihe gbasara ọha bụ Abimbola Oyeyemi ekwuola na ndi uwe ojii zoro onwe ha wee chebiri onye ohi a n’Ibafo, Ogun steeti. Ọ kọwara na onye ohi a na-akwado ịgbafu mgbe ha natara ozi maka ụgbọala a e zuru.

Ka e jidere ya, Philip kwuru na ya na onye otu ya kpọrọ onye ọkwa ụgbọ a gwa ya ka o buga ha otu ebe ma kwee nkwa inye ya ego. Ma ha ji egbe nara ya ụgbọala a. Ha bu n’obi ire ya bụ ụgbọala n’Ibadan.

Kọmishọna ndi uwe ojii ekwuola ka ebuga onye ohi a na Lagos ebe ha zuru ohi a.

Leave a Reply