FeaturedIgbo News

Ndị ụlọọrụ mgbasaozi ga-akwụ #5m maka okwu na-ebute iwe na nkewa

Views

Minista nke ozi na omenala, Alhaji Lai Mohammed, kwuru na Onyeisi ala Muhammadu Buhari akwadola nyocha iwu mgbasaozi nke na-eleba anya na ụtụ maka okwu niile nke na-ebute iwe na ọgbaghara, nke ndị ụlọọrụ mgbasaozi ga-atụ.

Minista a kwuru nke a n’Abuja ụnyaahụ, mgbe a na-anabata otu mmadu asaa ga-ahụ maka mmegharị iwu nke National Broadcasting Commission (NBC).

O kwuru na otu a ga-ebido ọrụ ozugbo site n’iwepụta iwu ọhụrụ ma mee ka ọhaneze mara, ọkachasị ndị ụlọọrụ mgbasaozi.

Ọ gwakwara ha ka ewepụta ịtụ ego ole ha ga-atụ nakwa ntaramahụhụ dịrị ha ma daa iwu ndi a.

Mohammed kwuru na ihe ndi a bụ maka ezi omume na ọrụ nakwa ụzọ eji egbochi ndi na-ebipụta ma na-ekwu okwu na-ese okwu.

Leave a Reply