Igbo News

Ndi UK adọọ Naijiria aka na nti maka ndi nwakpo

Views

Otu ụlọ ọrụ ‘UK Foreign and Commonwealth’ adọọla ndi Naijiria aka na nti maka ime njem na steeti ụfọdụ dị na Naijiria.

Ha kwuru ka akagbuo njem ọ bụla ha na-eme na steeti ndi a: Borno, Yobe, Adamawa, Gombe, Delta, Bayelsa, Rivers, Akwa Ibom, Cross River, Niger na Zamfara Steeti. Ha kwuru na ndi nwakpo nwere ike ibuso ndi Naijiria agha.

Ihe mere ha jiri nye ndụmọdụ bụ maka agha ndi Boko Haram busoro ndi steeti Maiduguri na Yobe. Ya mere, ha gwara ndi mmadu ka ha wezuga onwe ha ebe ọ bụla e nwere ọgbakọ; ma n’ ahia, ụlọ ụka, ebe a na-eri nri nakwa ebe a na-aṅụ mmanya. Ha kwukwara ka onye ọ bụla na-ege nti ma mụrụ anya ka azụ ka ha nwee ike imeghari ahụ ma nsogbu nchekwa ọ bụla dapụta.

Leave a Reply