FeaturedIgbo News

Ndị ugwu egosila mmeghachiahụ maka mmanụ achọtara n’ala ha

Views

Enwetala mmeghachiahụ ebe ọ dị ukwu maka mmanụ achọpụtara n’akụkụ ugwu na Nigeria. Ebe ụfọdụ ndị bi ebe ahụ nọ n’aṅụrị, ndị ọzọ nọ na mwute na iwe.

Ndị Nigerian National Petroleum Corporation n’izu gara aga kwuputara na achọtara mmanụ na Kolmani River II Well na Gongol Basin.

Nchọpụta e mere na-enye ndị NNPC obi ụtọ maka na o teela aka ha chọwara mmanụ na mpaghara ugwu.

Onyeisi oche Kaduna steeti Nigerian Bar Association, Napoleon Idenla kwuru na nchọpụta a e mere ga-emeba akụ na ụba ndị bi n’ugwu. Ọ ga-eme ka ndị mmadu ghara ị ga na ndịda ugwu ebe ha na-achọ ọrụ.

Onye nkwuchite ọnụ ndị Coalition of Northern Groups, Abdulaziz Suleiman, kwuru na e kwesiri ịchọta mmanụ kemgbe, ma ọ bụrụ na gọọmentị tinyere uchu na ya.

N’aka nke ọzọ, Onye ntụziaka Research and Documentation, Plateau steeti, Ọkz. John Wade, kwuru na ọ dị mkpa ka agbanaghụ imebi gburugburu ebe ahụ mgbe a na-amịpụta mmanụ,  dịka ha mere na Niger Delta.

Emilia Dasu kwuru na ekwesighi ka ndị mmadu ṅụrịa ọnụ maka nchọpụta n’ihi ihe steeti ndị ọzọ nwere mmanụ na-agabiga.

Na Kano, Abdulmunin Murtala, kwuru na ndị bi na Kano na-enwe aṅụrị maka nchọpụta a n’ihi na a gaghịzi ahụta ha dịka ndị ogbenye.

Site na Katsina, Bashir Bello kwuru na ndị mmadu na-ahụta nchọpụta dịka abụmọnụ ebe ndị ọzọ na-ahụta ya dịka ngozi. O kwuru na nke a ga-eme ka ndị mmadu bido zọwa onye ga-ejikwa ya bụ mmanụ. Ọ ga-eme ka ndị mmadu dị umengwụ ma nwe ntụkwasị obi na mmanụ.

Mz. Gyang Pam, onye ọrụ bekee, na-adọ ndị ọchịchị aka na ntị ka ha ghara iji ndọrọ ndọrọ ọchịchị mebisie onyinye ha nwetara. O kwuru na ndị ọchịchỊ ahapụla ihe ndị ha kwesịrị ime n’ihi mmanụ ha chọtara n’obodo a.

Leave a Reply