FeaturedIgbo News

Ndi Togo ebido ngaghari iwe na Lagos

Views

Ndi mba Togo bi na Naijiria apụtala n’ọnụọgụgụ ha ime ngaghari iwe na mkpesa ha n’Onikan, Lagos.

Gịnị bụ iwe ha? Ụmụnwoke na ụmụnwanyi ndi bụ ndi Togo apụtala n’ụzọ igosi iwe ha maka ọchịchị onyeisi ala ha bụ Faure Gnassigbe. Faure Gnassigbe na-azọ ọchịchị nke anọ ya ugbu a n’obodo Togo.

Faure Gnassigbe

Dika ndi PUNCH siri kọwa, ndi Togo na-enye mkpesa na nke a bụ afọ iri ise na itoolu (59) ezinaụlọ ndi be Gnassigbe na-achị mba Togo. Ha na-achọ enyemaka ụlọọrụ Economic Community of West African States (ECOWAS) nke isi ụlọọrụ ha dị na Niajiria (Lagos) ime ka ọchịchọ ezinaụlọ Gnassigbe bụrụ ihe efopụrụ n’ukwu.

Leave a Reply