EntertainmentFeaturedGossips

Ndị South Africa ajụ ntinye etinyere Burna Boy n’emume ha

Views

Ṳfọdụ ndi na-akụ egwu na South Africa, n’okpuru Tshwane Collective e degarala Minista nke Arts na Culture akwụkwọ nke na-agba ntinye etinyere Burna Boy n’emume ‘African Unite’ ụkwụ.

Ndị Tshwane Colective na-ajụ ihe mere e jiri wepụ ndị nke ha na-agụ egwu ma tinye Burna Boy; onye ha na-ebo ebubo na ọ kpalitere okwu na-ebute esemokwu mgbe e nwere mwakpo xenophobia.

Ma otu ọ dị, Minista nke Culture ekwuola na o nweghi ihe gbasara ha na ya bụ emume nakwa na o nweghi ego ha tinyere maka emume a.

Leave a Reply