FeaturedIgbo News

Ndi soja akụọla onye ọrụ Dangote refinery ihe

Views

Onye ọrụ nke a na-akpọ Olamide Adekanmbi ekwuola na ndi soja abụọ kụrụ ya ihe n’ụlọọrụ Dangote Oil Refinery nke dị na Lekki Free Trade Zone na Lagos Steeti. A chọpụtara na ndi soja na ndi ọrụ nwere nsogbu n’ebe a na-arụ. Ụbọchị ha nwere nsogbu a, Adekanmbi abịaghị ọrụ.

Dịka Adekanmbi kwuru, ha nwere nsogbu a n’ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Julai nke mere ka otu onye soja kụọ otu onye ọrụ ihe. Mgbe onye soja na-akụ onye ọrụ a ihe, ndi ọrụ ibe ya bidoro ịma ndi soja okwute.

N’echi ya, ka ọ bịara ọrụ, ndi soja họpụtara ya na mmadu abụọ ndi ọzọ wee kuwa ha ihe. Mkpu niile ọ na-eti na ya esoghi bụ ihe lara n’iyi. Ndi soja a kụrụ ya ihe nke metutara anya ya. Ka ọ dị ugbu a, Adekanmbi na-anara ọgwụ n’ụlọ ọgwụ.

Ọ gwara ndi ụlọọrụ maka ihe a merenu. E zigagoro ndi soja  a ebe ọzọ. Onye nkwuchite ọnụ ndi soja 81 division bụ Olaolu Daudu gwara Adekanmbi ka ọ bịa hụ ha maka mkpesa a.

Leave a Reply