Igbo News

Ndi PDP na-akọgheri akọgheri: Femi Adesina

Views

Femi Adesina, onye ndumọdụ Onyeisi ala Muhammadu Buhari, akparịala ndi Peoples Democratic Party (PDP) maka na ha kwuru na njem Buhari gara na Tokyo enweghi isi.

Na Sọnde, ndi PDP kwuru na egeghi Muhammadu Buhari nti n’emume 7th Tokyo International Conference on African Development.

Ha kwukwara na ụdị omume a gosiri na otu mba ụwa ajụla Onyeisi ala Muhammadu Buhari.

N’okwu nke Kola Ologbondiyan, onye nkwuchite ọnụ PDP kwuru, naani nkata efu na nkwa na-enweghi isi ka Onyeisi ala jiri lọta. Ha kwuru na nke a bụ ihe ihere na mkparị nyere obodo a.

Na mmeghachiahụ site n’igwe Twitter, Adesina kọwara ndi PDP dịka ndi na-arọ nrọ. O kwuru na ndi PDP na-akọgheri akọgheri.

Adesina jụrụ ndi PDP, ‘ụnụ e che na ọ bụ ọzụzụ na ọrịre ka a gara ebe ahụ ime?

Leave a Reply