FeaturedIgbo News

Ndi omekome zuru ụgbọala amabala n’ọnya Ndi Uweojii Anambra steeti

Views

Aka ndi uweojii  nke Anambra akparala ndi omekome ise ndi a napụtara ụgbọala ha zutere n’ohi. N’ abali ise n’ọnwa Ọgọstụ 2019 ka o jiri ọkara gafee elekere atọ nke ọnụ ụtụtụ, ndị uwe ojii na-esonye ndi Special Anti Robbery Sọuad (SARS) jidere mmadụ ndi a;

1, Emmanuel Amaechi (Nwoke)  afọ 35,

2; Innocent Onyedikachi (Nwoke) afọ 29,

3;  Obinna James (Nwoke)  afọ 20,

(4) Chukwuma Edeh (Nwoke) afọ 22, na

(5) Tochukwu Owor’ (Nwoke) afọ 27 n’ Ojoto na Idemili South LGA nke Anambra State.

Ha kpara nkata wee were egbe pụnari Nzube Unegbu ụgbọala Toyota Camry 2009/2010 ya n’ Onitsha na 4/8/2019. Ka ọ dị ugbu a, ebughachitela ụgbọ ala ahụ ma na-eleba okwu ha anya iji ma mgbe a ga-akpọga ha ụlọikpe.

Onye tinyere aka n’ọkwa bụ SP Haruna Muhammed PPRO Ndị uwe ojii steeti Anambra, n’aha Kọmịshọna ndị uwe ojii Anambra State Command

Leave a Reply