FeaturedIgbo News

Ndị Omeiwu, NBA, CDHR agwala Buhari ka ọ kwụsị ‘Operation Positive Identification’

Views

Ndị omeiwu nke steeti na Tuzde, kpọrọ Onyeisi ala Muhammadu Buhari ka ọ kwụsị ‘Operation Positive Identification’ nke ndị nchekwa obodo were atụmatụ ya.

Ọtụtụ ndị omeiwu nke steeti kwuru na atụmatụ a bụ ụzọ esi eyi ndị mmadu egwu.

N’otu aka ahụ, ndị Nigeria Bar Association na ndị Committee for defence of human rights kwukwara na atụmatụ adịghị mma ma ọlị.

Ndị nchekwa obodo n’ọnwa gara aga, kwuru na ha ga-eji ‘Operation Positive Identification’ chụpụ ndị ndi Boko Haram na steeti ebe ha nọ.

Ha mechara kwere na a ga-agbatị atụmatụ a na steeti ndị ọzọ. Ihe atụmatụ a pụtara bụ na a ga-akwụsị ndị Naijiria ọ bụla n’ụzọ ma gwa ha ka ha wepụta ihe nhụbama ọ bụla.

Mana ndị omeiwu agwala Muhammadu Buhari dịka ‘Commander-in-Chief of the Armed Forces, ka o leba anya n’atụmatụ a ma kwụsị ndị nchekwa obodo tụpụ ha ebido ya.

Leave a Reply