Igbo News

Ndi omeiwu ekwuola okwu gbasara ikpe ego ha na-etinye n’ụgbọala

Views

Ndi omeiwu nke Naijiria ekwuola okwu gbasara ikpe nke ndi mmadu wegara n’ụlọikpe, nke na-achọ ka akwụsị inye ndi omeiwu ego ruru ijeri naira ise na nde ise (#5.5m) maka ịzụ ụgbọala.

Ndi Naijiria nke a metụtara nakwa ndi Non-Governmental Organizations (NGO) dịka Social Economic Right and Accountability Project (SERAP), BudgIT na Enough is Enough (EiE), bụ ndi wegara ikpe a na Federal High Court nke dị n’Ikoyi, Lagos, ebe ha na-achọ ka akwụsi inye ndi omeiwu ijeri naira ise maka ụgbọala.

Mana onyeisi oche nke Senate Committee, Adedayo Adeyeye, kwuru na nke a bụ aka ọrụ ndi na-apụnarị mmadu ihe ha, ma kwuo na ọdịda ka ha ga-ezu.

O kwuru na dịka onye omeiwu, na ọnụbeghi ihe gbasara ego ụgbọala. O kwuru na ọ bụrụ na ndi omeiwu etinyela atụtụ a na mmefu ego ha, o nweghi ihe ọjọọ dị na ya n’ihi na o so n’iwu.

Ọ jụrụ na ebe ndi ọrụ ndi ọzọ na-enweta ụgbọala nke so ọrụ ha, keduzi otu nke ndi omeiwu ga-esi adị iche?

O kwukwara na ụfọdụ ụgbọala nke ha zụrụ kemgbe afọ anọ gara aga emebisiela ebe ụfọdụ erela nke ya. Ya mere o nweghi mpụ dị na ya.

Leave a Reply