FeaturedIgbo News

Ndị Oji Egbe awakpo ụlọ ndị Uweojii, bukọrọ egbe ha

Views

Ndị oji egbe ezu awakpola ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ikolaba, Ibadan n’Oyo steeti nke riri isi otu onye uweojii nọ ọrụ na Fraịde.

Dịka ndị SaharaReporters siri kọwa, otu onye uweojii bu mgbọ tụrụ ya n’ahụ were zọba isi onwe ya. Ka ndi oji egbe ezu ahụ gbuchara onye uweojii ebe ndị ọzọ gbara ọsọ, ha gara n’ihu kwasasịa ụlọ ndị uweojii were bukọrọ egbe na ngwaọgụ ndị ọzọ ha hụrụ n’ime ya bụ ụlọ ndị uweojii.

Gụọ: FG amapụta 13bn maka ndị Nche Ime Obodo

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Oyo bụ Gbenga Fadeyi mere ka a mara nke a.

Leave a Reply