FeaturedIgbo News

Ndi oji egbe aga egbuola onye Naijiria na South Africa

Views

Otu Nigeria Citizens Association na South Africa ekwuputala ọnwụ onye Naijiria a na-akpọ Mz. Benjamin Simeon na South Africa.

N’okwu nke Mz. Sunny Wenike Douglas, onye na-ekwuchitere otu a ọnụ kwuru, Benjamin Simeon, bụ nwoke afọ iri anọ na atọ, onye Okposi nke dị n’Ebonyi Steeti. O kwuru na ndi oji egbe aga gbagburu nwoke a, n’isi ụtụtụ Satọde na Johannesburg, obodo dị na South Africa. Mazi Simeon bụ onye na-akwọ ụgbọala. E kwuru na e gburu nwoke ozigbo ọ na-akwụsị onye o bu n’ụgbọala ya.

Ndi South African Police Service bugara ozu ya n’ebe a na-edokwa ozu nke dị na Johannesburg. Ụgbọala na ekwenti nke nwoke nwụrụ anwụ bụ ihe ndi enyere ọgọ ya nwoke, Mz. Emeka Isaac.

Douglas kwuru na ndi uwe ojii nke South Africa ebidola inyocha ya bụ okwu. O kwukwara na otu ya ga-agba mbo hụ na e jidere ndi mere ihe a ma gbaa ha akwụkwọ n’ụlọ ikpe.

Leave a Reply