FeaturedIgbo News

Ndi oji egbe aga egbuola ndi uwe ojii abụọ na Port Harcourt

Views

Ndi uwe ojii nke River State anwụchiela mmadu ruru itolu maka ọnwụ ndi uwe ojii abụọ na Mile 2 Diobu nke dị na Port Harcourt na Monde, ụbọchị mbu nke Julai.

Ndi uwe ojii a agbagburu, bụ ndi na-elekọta otu ụlọọrụ na-ere mmanya nke a na-akpọ Paddy Man na Nwachukwu Ojoto Street. Ndi oji egbe aga gbagburu ha mgbe ha na ụlọọrụ na-aga ụlọakụ itinye ego.

Site n’ọnụ onye na-ekwuchitere ndi uwe ojii ọnụ bụ Nnamdi Omoni, ndi uwe ojii biara ozugbo ihe a mere ma nwụchie ndi mere ihe a. O kwuru na n’agbanyeghi na ha ji mmadu itolu na ha ka na-eleba anya na ya bụ okwu.

Ndi uwe ojii rịọrọ ndi obodo ka ha nyere ha aka site n’ịgwa ha ihe ọ bụla ha ma banyere ihe mere. Ha nyekwara akara ekwenti ha ka ndi ma ihe ọ bụla kpọọ ha: 08032003524, 08098880134 na 08182157778.

Leave a Reply