FeaturedIgbo News

Ndị oji egbe aga egbuo mmadu ise ma mebie ụlọ onyeisi oche LG na Rivers

Views

Ndị oji egbe aga na Sọnde wakporo Opuoko na Lumene nke dị na Khana LGA nke Rivers Steeti, ebe ha gburu mmadụ ise, merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ ma mebie ọtụtụ ụlọ nke gụnyere ụlọ onyeisi oche Khana LGA, Hon. Lahteh Loolo.

Otu onye bi n’ obodo Opuoko kwuru na ndị omekome a kwaporo obodo ha n’isi ụtụtụ Sọnde mgbe ndị obodo a na-atụghị anya ha. O kwuru na mmadụ atọ nwụrụ n’Opuoko.

Otu onye ntorobịa nke si na Lumene kwuru na ndị a gburu mmadụ abụọ. O kwuru na ndị omekome  a gbalagara mgbe ndị uwe ojii wụchiri ebe ahụ.

Ndị uwe ojii nke Rivers, site n’ọnụ Nnamdi Omoni, kwuru na ụmụokorobịa ndị a si n’otu nzuzo wakporo obodo abụọ ndị a, gbuo ndị mmadụ ma mebisie ụlọ na ihe enwe enwe.

Ndị uwe ojii jidekwara mmadụ abụọ, ndị a na-ekwu na ha so na ndị omekome a. Ha gụnyere: Damwua Karagbara, onye dị afọ iri atọ na atọ, nakwa Dinee Prince, onye dị afọ iri abụọ na atọ.

Kọmishọna ndị uwe ojii na Rivers enyela iwu ka enyocha ya bụ ihe mere.

Leave a Reply