Igbo News

Ndi oji egbe aga egbuola inspektọ ndi uwe ojii n’Ondo

Views

A na-ekwu nke mere, ọzọ a na-eme. Ruo ole mgbe ka ụdị akụkọ a ga-ebe?

E nwetara ozi na ụfọdụ ndi oji egbe aga gbagburu inspektọ ndi uwe ojii, onye a na-akpọ Lasisi, na Mọnde n’ụzọ Isua-Ise Akoko nke dị n’Akoko South LGA n’Ondo Steeti.

Onye uwe ojii nwụrụnụ na ndi otu ya ndi ọzọ ebe nyocha ha mgbe ndi omekome a si n’ọhịa pụta ma gbasowe ndi uwe ojii ndi a egbe. Ndi otu ya ndi ọzọ gbafuchara ma Lasisi nwere isi ọjọọ ụbọchị ahụ. A chọpụtakwara na ndi omekome a nwere egbe ya gbalaga.

E bugala ozu nwoke n’ụlọ ọgwụ Ipe Akoko. E nyela ndi uwe ojii iwu ka ha chụwa ndi mere ihe a dịka Mz. Femi Joseph, onye uwe ojii na-ahụ maka ọha kwuru.

Leave a Reply