FeaturedIgbo News

Ndi oji egbe aga awakpola ụlọ ụmụakwụkwọ na Mahadum Uyo

Views

Ndi oji egbe aga awakpola mahadum nke Uyo n’abalị Wenezde, ebe ha zuru ego ụmụakwụkwọ na ụfọdụ ihe bara uru ha nwere. Ihe a mere na W6 hostel nke nọ n’ime mahadum a.

E kwuru na o nweghi onye nwụrụ na mwakpo a, mana ụfọdụ ụmụakwụkwọ merụrụ ahụ ebe ha na-achọ ụzọ ha ga-esi gbalaga.

Marcon Odiko, onye uwe ojii na-ahụ maka ihe gbasaara ọhanaeze kwuru na Tọzde na kọmishọna ndi uwe ojii, Mz. Zaki Ahmed, ezipula ndi uwe ojii n’ụlọ ụmụakwụkwọ niile. O kwuru na Ahmed nwere nzukọ, ya na onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ ka amara ihe a ga-eme ka akwụsị iwakpo ụlọakwụkwọ ha n’ihi na nke a abụghị mbu ha na-eme ihe dị otu a.

Ọ gwara ụmụakwụkwọ ka ga n’ihu na-eme ihe ha kwesiri ime n’ihi na ndi uwe ojii ga-eme ihe ha kwesiri ime iji hụ na e nwere udo na nchekwa na mahadum ha.

Leave a Reply