FeaturedIgbo News

Ndị Ọhanaeze chọrọ ka agbanwee aha Nigeria

Views

Ọhanaeze Ndigbo ekwuola na e kwesiri ime ngwa ngwa mgbanwe aha obodo Naijiria, ka Naijiria zawa aha ọzọ dị mma.

Otu ndị Igbo a kọwara na e kwesiri inwe mgbanwe aha n’ihi na aha a’Nigeria’ pụtara enweghi agamnihu, mpụ na ọchịchịrị.

Osote onye nkwuchite ọnụ otu a, Comr. Chuk Ibegbu kwuru na onye nyere anyị aha ‘Nigeria’ bụ enyi nwanyị Lord Lugard, onye mechara bụrụ nwunye ya, mgbe ihe ụtọ na-atọ ha.

O kwukwara na ọtụtụ obodo ndị dị n’Africa, Asia nakwa Europe gbanwere aha ndị ọchịchị nyere ha mgbe ha natachara nwereonwe ha. O kwuru na ọ bụ naanị ndị iberibe bụ ndị hapụrụ aha ha.

Otu a gwara ndị Naijiria ka enwe nzukọ ebe a ga-atụpụta aha ọhụrụ a ga-enye Naijiria ma ghọrọ nke ndị mma n’ime ha.

Leave a Reply