Igbo News

Ndi ọgba egbe wakporo ụlọ Rochas Okorocha

Views

N’abalị Fraidee bụ ubọchị iri atọ na otu nke ọnwa May ka ndi ọgba egbe amaghi ama wakporo ụlọ onye ọchịchị gara aga nke ndi Imo Steetị bụ Rochas Okorocha. Ebe obibi Rochas Okorocha dị n’Ogboko, Ideato South nke dị n’ Imo Steetị.

Ndi ogbu mmadu a batara be Rochas n’ elekere abụọ nke ụtụtụ dika onye ezinaulo ya siri kwuo. Ha meriri ndi nche nọ n’ọnụ ụzọ tụpụ ha abata n’ime isi ụlọ ya. Ndi a enweghi ihe bara uru ha wepụrụ, mana ime ulo na ebe ndi ọzọ ka ha kwasara. Nke a mere ejiri chee na ha bụ ndi ogbu mma e goro ego.

Nke a mere abalị abụọ Gọọmentị Steetị kwatuchara ihe ncheta ‘Akachi’ nke Rochas kpụrụ. mana Gọọmentị Steetị ekwuola na aka ya adighi n’ihe mere.

Leave a Reply