FeaturedIgbo News

Ndi oji egbe aga egbuola mmadu isii na Katsina

Views

N’abalị Satọde, ndi o ji egbe aga gburu mmadu isii na Dan Sabau nke dị na Kankara LGA, Katsina Steeti.

Onye na-ekwuchite ọnụ ndi uwe ojii nke Katsina Steeti bụ Gamba Isah kwuputara nke a mana ọ kọwaghị otu ihe siri mee.

Ndi mmadu kwuru na ndi omekome a bịara mgbe ndi mmadu na-akwado ihi ụra abalị. Ndi a nwụrụ anwụ ka etinyere n’ala n’ụbọchị ụka.

E chetakwara na Omyeisi ala Muhammadu Buhari zigara ndi na-echekwa obodo na Kankara na Danmusa LGA n’ụbọchị Wenezde, izu gara aga n’ihi nwakpo awakporo ha nke gburu mmadu iri na otu.

Leave a Reply