Igbo News

Ndi o ji egbe aga egbuola mmadu iri na asato na Zamfara

Views

Ndi o ji egbe aga egbuola mmadu iri na asatọ n’obodo ụfọdụ dị na Tsafe lokal gọọmenti di na Zamfara Steeti.

Onye isi ndi Tsafe bụ Muhammed Banwa kwuru nan di omekome a mere mpụ a n’abalị Tọzde, ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Juun. O kwuru na ha ji ọgbatumtum iri ise wee na-agba egbe aghara aghara nke gburu mmadu iri na asatọ a. Banwa gara leta ndi ihe a metụtara ma ndi merụrụ ahụ nọ n’ụlọ ọgwụ.

Onye omeiwu na-anọchị anya Tsafe local gọọmentị bụ Kabir Mai biara mgbaru n’ụlọ onye isi Tsafe. Kabir kwere ha nkwa iwelite okwu a na ụlọ omeiwu dị n’Abuja, ka ha nwee ike mee ihe kwesịrị maka nsogbu nchekwa. Ọ gwara ndi Tsafe ka ha dere duu ma na-ekpere Chukwu maka mkpuchite ha.

Leave a Reply