FeaturedIgbo News

Ndị nchekwa obodo ga-ebido ‘Operation Positive Identification’ na Naijiria taa

Views

Chief of Army Staff, Lt-Gen. Tukur Buratai, ụnyahụ, kwuru na ndị omeiwu, Onyeisi ala Muhammadu Buhari, na Minista nke Defence, Bashir Magashi, akwadola ha maka Operation Positive Identification.

O kwuru na emume e bidoro na North-east ga-agazu Naijiria niile, iji jide ndị Boko Haram, ndị kwagharịrị n’obodo Naijiria ndị ọzọ.

Burutai kwuru na ha agaghị eziga ndị armị n’obodo ndị a, kama ha etinye emume n’ime emume ndị ọzọ na-aga n’ihu.

O kwuru na ọnọdụ obodo a mere e jiri malite emume na steeti niile nke obodo a; izu ohi, ntọrọ mmadu na ihe ọjọọ ndị ọzọ na-eme n’obodo a.

 

Leave a Reply