FeaturedIgbo Culture

Ndị nchekwa emechie ebe Soyinka, Falana kwesịrị ime emume na Naịjirịa

Views

Ndị Uweojii, ndị Amị Naịjirịa na Department of State Service (DSS) na Mọnde, emechiela ebe e kwesiri inwe ọgbakọ; ebe Ọkankuzi Wole Soyinka na onye Ọkaikpe, Femi Falana (SAN) na ndị ọzọ kwesiri ikwu okwu gbasara ọnọdụ enweghị nchekwa nke dị n’Obodo.

Ụgbọala ndị uwe ojii nọchiri ebe ekwesiri ime emume a bụ ‘The Logos Centre’ nke dị na ụzọ Ibijoke, Oluyole, Lagos Steeti.

Isiokwu emume a ekwesịrị ime bụ; ‘Democracy, State Repression and the State of Insecurity in Nigeria’, nke ndị Coalition for Revolution (CORE) kwadoro.

CORE bụ otu nke onyeisi ha bụ Omoyele Sowore, onye eji eji ugbu a maka ngagharị iwe e mere nke gbasara mgbanwe gọọmentị Naịjirịa.

Mz. Olaseni Ajai na Baba Aye, ndị otu CORE, kwuru na ndị nchekwa obodo ekweghi onye nwe ebe ekwesịrị ime emume a banye n’ụlọ ahụ. Ha kwukwara na ndị nchekwa obodo a kpariri ma nwụchie ndi aka ha dị ọcha kwụ n’akụkụ.

Ha kwuru na ha ga emeriri ya bụ emume, ebe ọ bụ na ha akwụọla ụgwọ ebe ahụ. Otu a ka ha kwuru:

‘Anyị agaghi agbanwe ebe ekwesịrị ime emume a ka ụwa niile hụ otu gọọmentị Naịjiria dị n’ezie’.

Leave a Reply