FeaturedIgbo News

Ndị Naijiria otu narị na iri asaa na atọ si Libya alọtala

Views

Ndị National Emergency Management Agency (NEMA) na Tuzde, nabatara ndị Naijiria otu narị na iri asaa na atọ, ndị si Libya lọta.

NAN kọwara na ndị nlọta a, ndi ji ụgbọelu abụọ dị iche iche lọta, ka Onye nhazi Lagos Territorial Office, NEMA, Alhaji Abubakar Muhammed nabatara na Ọdụ Ụgbọelu Murtala Mohammed, Lagos.

Muhammed kwuru na ndị International Organization for Migration, (IOM) na ndị European Union (EU) nyere ndị a aka ịlọta, n’okpuru emume Assisted Voluntary Returnees nke bidoro na April, 2017.

O kwuru na mmadu otu narị na iri isii na abụọ bụ ndị si Misrata ma jiri ụgbọelu AI Buraq Air lọta, mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri na asatọ ka ọ kụọ elekere ise.

Mmadu iri na otu ndị ọzọ ji ụgbọelu si Bengazi lọta, mgbe o ji nkeji iri na ise gafee elekere ise.

O kwuru na ndị a lọtaranụ dị ụmụ nwanyị ndị okenye iri ise na abụọ, ụmụaka ndị nwanyị anọ na ụmụaka eku n’aka ndị nwanyị anọ.

N’aka nke ọzọ, ụmụ nwoke ndị okenye dị otu narị na isii, ụmụ aka ndị nwoke dị naanị abụọ, ebe ụmụaka eku n’aka ndị nwoke dị ise.

E kwukwara na mmadu iri abụọ na otu na ndị lọtaranụ ejighi ahụ mana ka ọ dị ugbu a, enyewela ha nleta kwesịrịnụ.

Leave a Reply