FeaturedIgbo News

Ndị Naijiria lara ezumike nka arịọla gọọmentị ka o leba anya n’ego a na-akwụ ha

Views

Ndị Naijiria gara ezumike nka n’okpuru otu Nigerian Union of Pensioners (NUP) na-eme ngagharị iwe ma na-agwa gọọmentị ka o leba anya n’ego a na-akwụ ha.

Ha zọrọ ije ga n’ụlọọrụ National Salaries, Incomes and Wages Commission nke dị n’Abuja.

Ha bulitere okwu a na-erughi ọnwa abụọ Gọọmentị etiti na ndị Labour Congress nwere nkwekọrịta gbasara puku naira iri atọ maka ‘minimum wage’.

Onyeisi otu a, Pa Abel Afolabi, kwuru na ọtụtụ n’ime ha bụ ego a ha na-anata bụ ihe ha ji ebi ndu. O kwuru na ụfọdụ na-anara puku naira iri dịka ego ọnwa.

Onyeisi oche National Salaries, Incomes and Wages Commission, Mz. Ekpo Nta kwuru na Onyeisi ala Muhammadu Buhari ebidola ileba anya n’okwu a.

Lee ihe eserese a ebe a:

 

Leave a Reply