FeaturedIgbo News

Ndị Naijiria akatọla Buhari maka ịhọrọ ụlọọrụ Turkish maka ịkwa akwa ndị nchekwa obodo

Views

Ndị na-ahụ maka akwa na mmepụta akwa na Naijiria akatọla Gọọmentị etiti maka inye ntụziaka ka ụlọọrụ Turkish na ndị Defence Industry Complex na Kaduna kwa akwa ndị nchekwa obodo.

Ha kwuru na ụdị ntụziaka nwere ike igbu ụlọọrụ ndị na-emepụta akwa na Naijiri, ya mere e kwesiri itinye ụlọọrụ ndị Naijiria n’ọrụ a.

Onye ntụziaka ụlọọrụ ‘Ruff ‘n’ Tumble’, Adenike Ogunlesi kwuru ha nwere nnukwu aṅụrị mgbe ha nụrụ na a ga-akwụsị mbubata akwa ndị nchekwa obodo n’ihi na o chere na ndị Naijiria ga-ewerezi ya bụ ọrụ.

O kwukwara na ha na-agba mbọ ịhụ na ụlọọrụ ha na-arụ ọrụ ọfụma. Mana ụdị mkpebi a Buhari mere gbara ha gharị.

Onye nwe Wessy Tailor, Otunba Wasiu Taiwo, kwuru na ụlọọrụ ebe ndị a na-arụpụta akwa na Naijiria emechiela maka na ha anaghị enweta ọrụ,

O kwukwara na gọọmentị kwesiri ịkwado ha site n’inye ha ọrụ.

Leave a Reply