Igbo News

Ndi Naijiria 187 alọtala; ebe ndi South Africa ji iwu jide ndi ọzọ

Views

Ọnụọgụgụ ndi Naijiria ndi lọtara ụnyaahụ belatara n’ihi na gọọmenti South Africa wepụtara iwu nke jidere ụfọdụ mmadu.

Naanị ndi okenye na ụmụaka otu nari na iri asatọ na asaa lọtara, ebe a na-atụ anya nlọta ndi Naijiria nari atọ na iri abụọ.

Ụgbọelu bulatara ndi a na Naijira rutere mgbe ọ fọrọ nkeji iri na asaa ka ọ kụọ elekere itoolu nke abalị, n’ọdụ ụgbọelu Murtala Mohammed.

Otu onye South Africa lọtaranụ, Victor Uche, kwuru na ọ hapụrụ nwunye ya bụ onye Cameroun na nwa ya lọtawa n’ihi akwa nne ya n’ebe.

Victor kwuru na o nweghi ihe o jiri lọta n’ihi na ndi South Africa na-eche na ndi Naijiria niile bụ ndi na-ere ahịa ọgwụ.

O kwukwara na ndi South Africa ekweghi ka ha lọta; onye zọrọ ha bụ Consulate nke Naijiria.

A chọpụtara na ndi South Africa kagburu akwụkwọ njem enyere ndi Naijiria, ndi kwesiri ịlọta.

Onyeisi oche Nigerian Daispora Commission, Oriakụ Abike Dabiri-Erewa, kwuru na e gburu ha oge ihe ruru awa iri na ise tụpụ ha ahapụ South Africa. Ọ gwakwara ndi nta akụkọ na ndi South Africa wepụtara iwu ọhụrụ nke mere na ọtụtụ ndi Naijiria abanyeghi n’ụgbọelu ahụ.

Dabiri-Erewa kwuru na gọọmenti etiti nyere ndi a lọtaranụ ego ekwenti ruru puku naira iri anọ nakwa puku naira iri dịka ego njem. O kwukwara na Bank of Industry nwere atụmatụ inye ndi a ego ha ga-eji bido ahịa.

Onyeisi ọrụ na AirPeace, Oriakụ Toyin Olajide, kwuru na ndi AirPeace mefuru nde puku naira atọ maka ịkpọlata ndi a.

Leave a Reply