Igbo News

Ndi na-ere ahia iwu egbuola otu onye custom

Views

Otu onye ọrụ Custom na Lagos bụ onye ndi na-ere ahịa iwu gbagburu n’Ogun Steeti. Jerry Attah, onye nkwuchite ọnụ Federal Operations Unit nke ụlọ ọrụ Custom kwuru na-egburu officer a ebe ọ na-eme mkpagharị n’Akinrun, obodo dị ime Ota, Yewa North.

O kwukwara na ndi ahịa iwu ndi a merụrụ ofisa ọzọ a na-akpọ Joseph ahụ. Akụkọ kwuru na ndi ofisa ndi a na-alọta mkpagharị ha, ebe ha nwụchịrị ndi ahịa iwu bu osikapa. Ihe ha na-amaghị bụ na ndi ahịa iwu ndi a echebirila ha n’ụzọ.

E nwebeghi onye ndi uwe ojii nwụchịrị maka omume a, kama ha kwuru na ha ka na-eleba anya n’okwu otu o kwesiri.

Leave a Reply