Igbo News

Ndi na-achi ehi enweghi ebumnobi iwakpo ndi Igbo

Views

Otu ndi na-achị ehi na mpaghara ọwụwa anyanwu bụ Myetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) ekwuola na ha enweghi atụtụ iwakpo ndi bi na mpaghara ọnwụnwa anyanwụ Naijiria.

N’okwu nke ha gụpụtara n’ Awka; otu a agọnahụla akụkọ nke kwuru na ndi na-achi ehi ga-ebili megide ndi Igbo. Onyeisi oche ndi MACBAN bụ Alhaji Gidado Sidikki kọwara akụkọ a dika nke na-ebute esemokwu. O kwuru na MACBAN ekwughi ụdị okwu na Abuja ma ọ n’ebe ọ bụla.

N’ịkọwa otu ha na ndi Igbo siri di, ọ sịrị na enweghi nsogbu dị n’etiti ndi gọvanọ na ndi na-achị ehi. N’agbanyeghi obere esemokwu na-apụta, ndi ọchịchị na ndi obodo ha bi n’ime ya na-enye aka ịhụ na udo dị n’etiti ndi na-achị ehi na ndi nwe ala.

Leave a Reply