Igbo News

Ndi na-achị ehi awakpola obodo nọ n’Ogun Steeti

Views

Ndi a na-enyo dika ndi na-achị ehi wakporo obodo nọ n’Ogun Steeti n’abalị Tọzde ma merụọ onye ndu ndi obodo ahụ bụ Chief Ismail Adasofunjo ahụ.

Ndi nwakpo a mebiri ebe niile ma gbuo Adasofunjo mma n’isi. Ka ọ dị ugbu a, nwoke a nọ n’ụlọ ọgwụ.

Na nchọcha e mere, e kwuru na ha wakporo agadi nwoke a maka na nwunye ya ekweghi eresi ndi na-achị ehi abụọ sịga. Nwunye nwoke a kwuru na ndi na-achi ehi a bịara ịzụ siga ma o nweghi ụdị ha chọrọ. Ma ndi na-achị were iwe ma chọọ iti ya ihe, ọ gbara ọsọ gbaba n’ime ụlọ. Ndi a na-achị ehi zutere di ya n’azụ ụlọ ma were mma merụọ ya ahụ.

Nwunye nwoke a bụ Bilikisu kwuru na ndi na-achị anaghi ekwe ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.

Leave a Reply