FeaturedIgbo News

Ndi na-achị ehi achụọ ndi nkuzi na ụmụakwụkwọ n’Ogun

Views

Ndi nkuzi na ụmụakwụkwọ agbaala ọsọ n’ụlọ akwụkwọ primari na sekondiri di n’Alabata nke dị n’Odeda LGA n’Ogun Steeti maka mwakpo nke ndi na-achị ehi.

Ndi ọchị ehi a wakporo obodo Seriki na Alabata ma gbuo onyeisi obodo ahụ bụ Chief Akanmu Laisi, n’ọnwa gara aga. Ndi a wakpokwara obodo Adao ma gbuo onye na-arụ ọrụ ugbo, bụ Rafiu Showemimo, n’izu gara aga.

N’ihi mwakpo ndi a, ụlọ akwụkwọ emechiela ebe ndi nkuzi, ụmụakwụkwọ na ndiisi ụlọ akwụkwọ anaghizi abịa akwụkwọ ka ha ghara ịbụ ndi ndu ha lara n’iyi n’ aka ndi ọchị ehi. Ndi obodo ndi a na-arịọ gọọmentị ka ha weta nchekwa n’obodo ha ọ kachasi ndi uwe ojii.

Na mmeghachi ahụ gbasara nke a, gọvanọ nke steeti Ogun kwere ha nkwa iweta ezi nchekwa n’obodo ndi a.

Leave a Reply