FeaturedIgbo News

Ndị Labour ebusola FG agha maka $100bn ndị IOCs ji

Views

Ndị National Labour Congress na Tuzde, katọrọ Gọọmentị etiti maka ego ọzọ ọ na-akwado ibiri na World Bank.

Ndị NLC kwuru na kama a ga-ebiri ego ọzọ, ọ ka mma ka Gọọmentị etiti leba anya mara ka a ga-esi gbata ụgwọ ruru otu ijeri nari dollar nke ndị International Oil Companies ji ya.

Onyeisi ndị NLC, Ayuba Wabba, kwuru nke a na mmepe nzukọ 2019 national leadership retreat, n’Enugu. Ọ kpọkwara Gọọmentị etiti ka nyocha usoro e ji akwụ taks n’obodo, nke ga-eme ka ndị ọgaranya kwụwa taks.

Ndị Debt Mangement Office kwuru na ụgwọ Naijiria ji eruola puku ijeri ato na ijeri iri atọ na abụọ na naira. Ya mere, Wabba na-akpọ gọọmentị oku ka ha chọọ ewu ojii mgbe chi ka dị.

 

Leave a Reply