FeaturedIgbo News

Ndi IPOB wakporo m na Germany: Ekweremadu

Views

Osote onyeisi ụlọ omeiwu gara aga, Ike Ekweremadu ekwuola na ụfọdụ ndi Indigenous People of Biafra wakporo ya na Nuremberg, Germany.

Ekweremadu kwuru na nke a mere mgbe ọ gara emume ‘Second Annual Cultural Festival and Convention’, nke Ndigbo haziri na Germany, ebe o kwesiri ịgwa ọhanaeze bịara ebe ahụ okwu.

O kwuru na mgbe o rutere ebe ahụ, Ndigbo nabatara ọfụma rue mgbe ụfọdụ ụmụokorobia ndi ahụrụ dịka ndi IPOB. Ndi IPOB a gwara ya na obi adịghị ha mma maka otu esi egbu ndi Igbo na mpaghara ndịda ugwu. N’ihi nkea, ha kwuru na o nweghi mmemme ndi Igbo a ga-eme ebe ahụ.

Iji belata mgbawoju anya ndi a wetara, Ekweremadu nwara ike ya ime ka udo dị. Mana ọbara ụmụokorobia ndi dị ezigbo ọkụ. Ha ji akwa saa ya ahụ na ya bụ ọgbakọ.

Ekweremadu kwuru na ụdị agwa a ha kpara wutere ya n’ihi na ọ bụ onye Igbo, bụrụkwa onye gbara mgbo ịhụ na-akwụsiri mmegbu a na-enye ndi IPOB.

Ka ọ dị ugbu a, Ekweremadu na-ekele ndi mmadu; ndi kpọrọ ya na ndi zitere ya ozi ma gwa ha na ahụ siri ya ike.

Leave a Reply