FeaturedIgbo News

Ihe butere mmerụahụ ndị IPOB 17 n’Ebonyi

Views

Ndị Indigenous People of Biafra nke dị n’Ebonyi steeti, na Tuzde, kwuru na ndị otu ya mmadu iri na asaa merụrụ ahụ site na egbe ndị uwe ojii mgbe ha wakporo nzukọ ha n’Oguzorowenya Primary School n’Ogbodo, nke dị n’Ebonyi North LGA.

Onye uwe ojii nke Kpirikpiri Police Division, John John, onye merụrụ ahụ, boro ndị IPOB ebubo maka ya bụ mmerụ ahụ.

Ndị IPOB kwuru na ndị uwe ojii gbara ha egbe mgbe ha rutere ebe ha na-enwe nzukọ. Ha kwuru na ndị uwe ojii merụrụ mmadu iri na asaa ahụ ma kpọrọ mmadu karịrị iri asaa.

Onye nkwuchiteọnụ ndị uwe ojii, DSP Loveth Odah, kwuru ndị uwe ojii nwụchiri naanị mmadu asaa. O kwukwara na ndị IPOB wakporo ha mgbe ha rutere ebe ahụ. Ha merụrụ onye uwe ojii John John, onye na-akwadoghi onwe ya ọfụma

O kwukwara na ha agbaghị ndị IPOB egbe, kama ha ji ‘tear gas’ chụsasia ha.

 

Leave a Reply