Igbo News

Ndi IPOB echebiri Onyeisi ala Buhari na Japan

Views

Ndi otu Indigenous People of Biafra (IPOB) agbakọọla na Japan, ebe ha na-eche Onyeisi ala Muhammadu Buhari dịka onyeisi ha, Nnamdi Kanu siri gwa ha.

Onyeisi ala Muhammadu Buhari kwesịrị ịga emume Seventh Tokyo International Conference on African Development (TICAD7), nke a ga-eme na Yokohama.

N’ozi nke Nnamdi Kanu ziri, ọ gwara ezinaụlọ IPOB niile ka ha pụta n’igwe jide Jubril ma nyefee ya n’aka Gọọmentị Japan maka nyocha.

O kwuru nke a ka ndi otu ya wakpochara Omeiwu Ike Ekweremadu na Nuremberg, Germany, n’emume iri ji ọhụrụ.

E kwukwara na Nnamdi Kanu degara Emperor nke Japan, Naruhito leta maka Jubril onye na-egosi onwe ya dịka Onyeisi ala Muhammadu Buhari.

Lee ihe eserese ndi a, nke na-egosi ndi Biafra na Japan.

Leave a Reply