FeaturedIgbo News

Ndị Igwe Imo agwala FG ka ọ hapụ Nnamdi Kanu ka ọ lọta lie nne ya

Views

Ndị Igwe n’Ọrlụ, Imo steeti, na Tọzde, rịọrọ Gọọmentị etiti ka ọ hapụ onye ndu ndị Indigenous People of Biafra, Nnamdi Kanu, ka ọ lọta Naijiria bịa lie nne ya, Sally, na-enweghi nsogbu ọ bụla.

Ha rịọrọ nke a n’Amakwo Event Centre nke dị n’Ọrsụ LGA, Imo steeti.

Ndị eze a, site n’ọnụ onye ndu ha, Igwe Gideon Ejike, kwuru, ‘Nnamdi Kanu abụghị onye na-eyi ọha egwu. Ndị na-eyi ọha egwu na-egbu mmadu, anyị ahụbeghi onye Nnamdi Kanu gburu. Ọ bụ dike anyị, ya mere e kwesiri ịhapụ ya ka ọ bịa lie nne ya dịka nwoke mbụ nke nne ya’.

Ndị igwe a kpọkuru ndị United Nations ka ha tinye ọnụ n’okwu a.

 

Leave a Reply