Igbo News

Ndi Igbo chefuo ọchịchị na Naijiria: Okorocha

Views

Onye omeiwu na-anọchị anya Imo West bụ Rochas Okorocha adụọla ndi Igbo ọdụ ka ha wepụ uche n’ọchịchị onyeisiala Naijiria. Nke a bụ ihe ọ gwara ndi nta akụkọ mgbe ehibere ya dịka omeiwu na Tọọzde.

O kwuru na ọchịchị bụ ihe a na-azọ azọ, na ọ bụghị ihe a na-enye n’efu. Ya mere, ndi Igbo agaghị afanye aka n’akpa ma na-achọ ka ọchịchị ruo ha aka. Ọ gara n’ihu kwuo na ọchịchị onye kwuo uche ya bụ maka ndi obodo niile na ọ bụghị ihe gbasara sọọsọ ndi Igbo. Ọ sịrị na ndi Igbo enweghi ikike ime onwe ha onyeisiala.

Leave a Reply