FeaturedIgbo News

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ ndị eriri eri – Nnamdị Kanụ

Views

Mazị Nnamdị Kanụ, onye isi otu ndị IPOB azaghachila ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ndị gọrọ agụgọ na ha amaghị ihe ọbụla gbasara OPERATION PYTHON DANCE nke abụọ e mere n’ala Igbo n’afọ 2017.

Cheta na Odumblog kwuru na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ agọọla agụgọ na ha amaghị ihe ọbụla gbasara Python Dance.

Na abalị ụbọchị Satọde, Mazi Nnamdị Kanụ si n’akara twitter ya zaghachi ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ. N’okwu ne ya ,ọ sịrị;

” Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ, ọ bụrụ na ụnụ amaghị maka Python Dance nke abụọ, gịnị mere ụnụ jiri machi otu IPOB n’otu oge ahụ? Ndị gọvanọ ndị ugwu na-adụ ụnụ ọdụ ịpịgbu IPOB enweghi ajọ ebumnoobi, bụ ha na-abanyere ndị Fulani ọṅụ ọbara aja n’ukwu. Onye na-aghọgbu ibe ya? Oge agaala”

Leave a Reply