FeaturedIgbo News

Ndi Fulani ọchị ehi agbagbuola nwa onye ndu Afenifere

Views

Ndi Fulani ọchị ehi egbuola nwa onye ndu otu Afenifere bụ Reuben Fasolanti n’ụzọ awarawara si Benin gaa Ore. Nwata nwanyi e gburu ka a na-akpọ Funke Olakunri.

Odoziakụ Funke bụ onye nọ n’ụzọ ije mgbe ndi Fulani ọchị ehi zutere ya na ndi ọzọ nọ n’ụgbọala, ma kpọrọ ndi nọ n’ime ụgbọala ahụ. Funke bụ onye agbagburu ebe ha kpọghara otu onye nke ọzọ nọ n’ụgbọala ahụ.

Dika e kwuru, Odoziaku Funke bụ onye si Lagos aga Ondo ịga nọnyere ndi ikwunne ya tupu ihe mberede a ezute ya n’ụzọ.

Onye nkwuchite ọnụ ndi uwe ojii bụ Femi Joseph kwuru na o dobeghi anya ma ọ bụ ndi ohi ka ọ bụ ndi ọchị mere ihe ọjọọ n’agbanyeghi na ndi Fulani ọchị na-enye nsogbu n’okporo ụzọ ahụ kemgbe.

Onye nkwuchite ọnụ ndi Afenifere bụ Mazi Yinka Odumakin kwuru na omume ndi Fulani ọchị ehi akpalitela iwe ha. Omume ha gosiri na ha chọrọ agha n’aka ndi Yoruba. Ọ gwara ndi mmadu ka ha chebiri ihe ha ga-eme.

Leave a Reply