FeaturedIgbo News

Ndi Fulani na-achị ehi na-eyi anyị egwu: Mahadum Illorin

Views

Bolaji Sule, osote onye isi ụlọakwụkwọ Mahadum nke Illorin ekwuola na ndi na-achị ehi na-awakpo ubi ndi nọ n’akụkụ ụlọakwụkwọ ha ma na-eyikwa ndi nkuzi na ụmụakwụkwọ egwu.

Dịka o kwuru na nzukọ ya na ụfọdu ndi nchekwa obodo nwere na Kwara; Sule kwuru na ha emeela ihe ha kwesiri ime mana ihe na-ebe ka na ebekwa. O kwukwara na ndi na-achị ehi na-ezu ihe ha ji arụ ọrụ n’ụlọakwụkwọ ha nakwa ihe ha kụrụ n’ubi.

Sule kwuru na ala ndi a bụ ihe ga-abara ha uru n’ọdịnihu mana ha enweghi ike iji ya mee ihe ọ bụla maka egwu ndi na-achị ehi.

Yunus Alade-Saliu, onye nnọchianya ndi ngalaba State Services kwuru na omume ndi ọchị ehi a bụ nke a na-agaghị anabata ọzọ.

Leave a Reply