FeaturedIgbo News

Ndị FRSC agọnahụla ‘Chip Whip’ nke edere dịka nọmba ụgbọala

Views

Ndị Federal Road Safety Corps (FRSC) emeela ka a mara na ha emepụtaghị ma ọ bụ nye ọbụla nọmba ụgbọala nke e dere ‘Chip Whip’, nke ụgbọala ‘chief whip’ Kano steeti bu.

N’okwu nke ha nyere na Sọnde, Bisi Kazeem, onye ọrụ FRSC na-ahụ maka nkuzi ọha, kwuru na nọmba ụgbọala a esighi n’ebe a na-emepụta nọmba ụgbọala n’ụlọọrụ FRSC pụta.

O kwuru na ụlọọrụ ha agaghị eme ụdị mmejọ a n’ihi usoro ndị ha na-agabiga tụpụ arụpụta ngwa ụgbọala ọ bụla.

Ya mere, ha na-eme ka ọhanaeze mara na mmejọ a esighi n’ụlọọrụ ha.

O kwukwara na e nyela iwu ka enyocha marae be mmiri siri baa n’opi ụgbọgụrụ ma nye ndị ikpe mara ntaramahụhụ kwesiri ha.

Leave a Reply