FeaturedIgbo News

Ndị Eze Anambra etoo Buhari maka akwa mmiri Niger nke abụọ (Second Niger Bridge)

Ndị Eze nọ n' Anambra etoola Onyeisiala Buhari maka mbọ irụ akwa mmiri Niger nke abụọ (Second Niger Bridge)

Views

Ndị Eze nọ n’ Anambra etoola Onyeisiala Buhari maka mbọ irụ akwa mmiri Niger nke abụọ (Second Niger Bridge) na ọrụ ndị ọzọ na-aga n’ihu n’ ala Igbo.

Ndị Eze nọ n’Anambra na Prince Engr. Arthur Eze nwere ọgbakọ n’obi Igwe Ukwulu, Dunukofia n’Anambra steeti; Igwe Peter Uyanwa n’ ụbọchị Satọdee. Ha metụrụ aka na mkpa ọ dị ibugara Onyeisiala Buharị ụkpa ekele maka; akwa mmiri Niger nke abụọ, okporoụzọ si ọnịcha gaa Enugu wee banye Porthacourt, nakwazi ọdụ ụgbọelu mba ofesi dị n’Enugu ọ na-arụ.

Igwe ndị Ukwulu, Dunukọfịa bụ Igwe Peter Uyanwa, n’ọgbakọ a kọwara ọrụ ndịa dịka nzipụta ịhụanya onyeisiala Buhari nwere nye ala Igbo.

kpọkukwaziri gọọmentị ka ahazie ya bụ osimiri Niger ka ọ dị mma nnwukwu ụgbọmmiri ịgba na ya iji nyere azụmahịa aka n’ala Igbo.

5 Comments

Leave a Reply